Amos 4

Izrel alọghachibeghị nʼebe Chineke nọ

1Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria,
unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa,
ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ”
2Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị,
“Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa
mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ;
jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.
3Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo,
ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ,
a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
4“Gaanụ na Betel, ma jehie.
Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba.
Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile.
Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ
Maọbụ, nʼafọ atọ
ọbụla.
5Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko;
kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye,
nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel,
nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

6“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha
Eze ha dị ọcha nʼihi erighị nri ọbụla
nʼobodo unu niile,
mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile
ma unu alọghachikwuteghị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

7“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara
Maọbụ, kwụsịkwara
mmiri izoro unu,
mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido.
Enyere m otu obodo mmiri ozuzo,
ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ.
Mmiri zoro nʼotu ubi,
ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.
8Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ,
ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ,
ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

9“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge,
werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha,
zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile,
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe
dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt.
Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,
mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha.
Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu
Maọbụ, ebe obibi
unu jupụta imi unu,
ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

11“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu
dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.
Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ,
ma unu alọghachikwuteghị m,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

12“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel.
Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a,
jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”

13Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile,
onye na-ekekwa ifufe,
nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ,
onye na-emekwa ka chi ọbụbọ
Ya bụ, ụtụtụ
ghọọ ọchịchịrị,
na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Copyright information for IboBIU